5Nzọ ụkwụ m akpafubeghị site nʼụzọ gị, ụkwụ m agbụchapụghịkwa site nʼọnọdụ ya.
6Ana m akpọku gị, O Chineke, nʼihi na amaara m na ị ga-aza m; gee m ntị ma nụrụ ekpere m.
7Zipụta ịhụnanya gị dị oke ebube; gị onye na-eji aka nri gị dị ike azọpụta ndị niile gbabara na gị site nʼaka ndị iro ha.
8Chebe m dịka mkpụrụ anya gị; zoo m na ndo nke nku gị,
9site nʼaka ndị ajọ omume gbara m gburugburu, ọ bụladị ndị iro m, ndị chọrọ igbu m.