7Zipụta ịhụnanya gị dị oke ebube; gị onye na-eji aka nri gị dị ike azọpụta ndị niile gbabara na gị site nʼaka ndị iro ha.
8Chebe m dịka mkpụrụ anya gị; zoo m na ndo nke nku gị,
9site nʼaka ndị ajọ omume gbara m gburugburu, ọ bụladị ndị iro m, ndị chọrọ igbu m.
10Ha anaghị eme ebere, ha bụ ndị afọ tara mmiri, okwu ịnya isi juru ha ọnụ.
11Ha achọpụtala ebe m nọ, ugbu a, ha gbara m gburugburu, ha ji anya nkọ, jikerekwa ịtụ m nʼala.