12Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu; oke ehi dị ike nke Bashan gbara m gburugburu.
13Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa asaghepụla ọnụ ha megide m.
14A wụpụla m dịka mmiri, ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha. Obi m agbazela dịka mmanụ, obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m.
15Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime. Ire m na-araparakwa m nʼọnụ, nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ.
16Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu; otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu, ha adupuola m aka m na ụkwụ m.