15Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime. Ire m na-araparakwa m nʼọnụ, nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ.
16Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu; otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu, ha adupuola m aka m na ụkwụ m.
17A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ; ndị mmadụ na-ele m anya na-emikwa ọnụ ọchị
18Ha na-eke uwe m nʼetiti ha, ha sitere nʼife nza kee uwe m.
19Ma gị, Onyenwe anyị, anọla m ebe dị anya; gị Onye bụ ike m, mee ngwangwa bịa nyere m aka.