1Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m. I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị.
2O Onyenwe anyị Chineke m, akpọkuru m gị, ka i nyere m aka, ị gwọkwara m.
3O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m, i mere ka m dịrị ndụ.
4Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ndị nsọ ya, toonu aha nsọ ya.