17Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha. Ọ bụ ezie na ịnyịnya dị ike, ma ha apụghị ịzọpụta ndị nwe ha.
18Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche, ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ.
19Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ. Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ.
20Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị; ọ bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị.
21Obi anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime ya; nʼihi na anyị tụkwasịrị aha nsọ ya obi.