16ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ, ime ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha nʼụwa.
17Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka; ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile.
18Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.
19Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu, ma Onyenwe anyị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile.
20Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam. Ọ gaghị ekwe ka ọ bụladị otu ọkpụkpụ dị ha nʼahụ gbajie.