18Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.
19Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu, ma Onyenwe anyị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile.
20Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam. Ọ gaghị ekwe ka ọ bụladị otu ọkpụkpụ dị ha nʼahụ gbajie.
21Ihe ọjọọ ga-eme ka onye ajọ omume nwụọ; ndị na-akpọ onye ezi omume asị ka a ga-ama ikpe ọnwụ.
22Onyenwe anyị na-agbapụta ndị ohu ya; ọ dịghị onye ọbụla nke na-agbaba nʼime ya a ga-ama ikpe ọnwụ.