1Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m.
2Mkpụrụobi m ga-anya isi na Onyenwe anyị; ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ.
3Soro m too Onyenwe anyị; ka anyị bulie aha ya elu.
4Nʼihi na etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ zakwara m, napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile.