7Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu na-anapụtakwa ha.
8Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma; onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya.
9Tụọnụ egwu Onyenwe anyị, unu ndị nsọ ya, nʼihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị niile na-atụ egwu ya.
10Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha, ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ Onyenwe anyị.
11Ụmụ m, bịanụ gee m ntị; aga m ezi unu ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ.