10Ihe niile dị nʼime m ga-eti mkpu sị, “O Onyenwe anyị, ọ bụ onye dịka gị? Ị na-agbapụta ndị na-adịghị ike site nʼaka ndị dị ike karịa ha, ma na-anapụta ndị ogbenye ndị chọrọ enyemaka site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ha nwere nʼike.”
11Ndị akaebe, ndị kwara obi nʼazụ na-apụkwute m; ha na-ebo m ebubo ihe ndị m na-anụbeghị ihe banyere ha na mbụ.
12Ana m emere ha ihe ọma, ma ha na-akwụghachi m ihe ọjọọ. Nke a na-ewute mmụọ m ruo nʼọnwụ.
13Mgbe ha na-arịa ọrịa, eyiri m akwa mkpe, site na ibu ọnụ weda onwe m nʼala. Mgbe ekpere m lọghachikwutere m na-enweghị ọsịsa,
14ejegharịrị m nʼọnọdụ iru ụjụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne m, maọbụ enyi m, jegharịakwa nʼobi ọjọọ dịka a ga-asị na ọ bụ nne m na-arịa ọrịa ahụ.