Abụ Ọma 35

ejegharịrị m nʼọnọdụ iru ụjụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne m, maọbụ enyi m, jegharịakwa nʼobi ọjọọ dịka a ga-asị na ọ bụ nne m na-arịa ọrịa ahụ.

Psalm 35:14 (UKJV) I behaved myself as though he had been my friend or brother: I bowed down heavily, as one that mourns for his mother.

12Ana m emere ha ihe ọma, ma ha na-akwụghachi m ihe ọjọọ. Nke a na-ewute mmụọ m ruo nʼọnwụ.

13Mgbe ha na-arịa ọrịa, eyiri m akwa mkpe, site na ibu ọnụ weda onwe m nʼala. Mgbe ekpere m lọghachikwutere m na-enweghị ọsịsa,

14ejegharịrị m nʼọnọdụ iru ụjụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne m, maọbụ enyi m, jegharịakwa nʼobi ọjọọ dịka a ga-asị na ọ bụ nne m na-arịa ọrịa ahụ.

15Ma mgbe m dahiere, ha zukọtara na-aṅụrị ọṅụ; mgbe m na-adịghị ele anya, ha biliri imegide m. Ha na-ekwulu m na-esepụghị aka.

16Dịka ndị ajọ omume, ha na-akwa m emo nʼiwe, na-atakwara m ikikere eze ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.