17O Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-ele ihe na-eme? Gbapụta ndụ m site na mbibi ha niile, site nʼaka ụmụ ọdụm ndị a, gbapụta ndụ m dị oke ọnụahịa.
18Aga m enye gị ekele nʼihu ọha mmadụ dị ukwuu, nʼetiti ọha kachasị ibe ya dị ukwuu, ka m ga-anọ too gị.
19Ekwekwala ka ndị ahụ bụ ndị iro m, mgbe o nweghị ihe m mere ha, chịa m ọchị; ekwekwala ka ndị ahụ kpọrọ m asị nʼihi iro, mgbe o nweghị ihe m mere ha nwee izuike.
20Nʼihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu, kama ha na-echepụta ebubo ụgha dị iche iche megide ndị ahụ na-anọrọ onwe ha jụụ nʼime ala ahụ.
21Nʼiju anya, ha na-ele m anya na-eti mkpu na-asị, “Ewoo! Ewoo! Anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ya.”