6Mee ka ụzọ ha gbaa ọchịchịrị, bụrụkwa ebe na-amị amị; ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụ ha ọsọ.
7Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ha, ma ha siere m ọnya, gwukwaara m olulu nʼụzọ m.
8Ka mbibi bịakwasị ha na mberede, ka ụgbụ ha zobeere m kee ha; ka ha lakwaa nʼiyi site nʼidaba nʼolulu ahụ ha gwuru.
9Mgbe ahụ, mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ na Onyenwe anyị, ọ ga-enwekwa obi ụtọ nʼime nzọpụta ya.
10Ihe niile dị nʼime m ga-eti mkpu sị, “O Onyenwe anyị, ọ bụ onye dịka gị? Ị na-agbapụta ndị na-adịghị ike site nʼaka ndị dị ike karịa ha, ma na-anapụta ndị ogbenye ndị chọrọ enyemaka site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ha nwere nʼike.”