19Nʼoge ihe ndakwasị, ha agaghị akpọnwụ; ha ga-erijukwa afọ nʼụbọchị ụnwụ.
20Ma ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi. Nʼagbanyeghị na ndị iro Onyenwe anyị dịka ịma mma nke ubi ahịhịa ndụ, ha ga-agabigakwa ngwangwa nʼanya dịka anwụrụ ọkụ.
21Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya, ma onye ezi omume na-eme amara na-enye ndị ọzọ ihe o nwere.
22Ndị Onyenwe anyị gọziri agọzi ga-eketa akụ nke ụwa, ma ndị ọ bụrụ ọnụ ka a ga-egbuchapụ.
23Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ, ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike;