21Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya, ma onye ezi omume na-eme amara na-enye ndị ọzọ ihe o nwere.
22Ndị Onyenwe anyị gọziri agọzi ga-eketa akụ nke ụwa, ma ndị ọ bụrụ ọnụ ka a ga-egbuchapụ.
23Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ, ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike;
24ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada, nʼihi na Onyenwe anyị na-eji aka ya ejigide ya.
25Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi, ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume, maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.