23Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ, ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike;
24ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada, nʼihi na Onyenwe anyị na-eji aka ya ejigide ya.
25Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi, ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume, maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.
26Mgbe niile, ha na-eme amara jiri obi ha na-agbazinye ndị mmadụ ihe, ụmụ ha ga-abụ ngọzị.
27Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe, mgbe ahụ, i ga-ebi nʼala a ruo mgbe ebighị ebi.