5Nyefee onwe gị nʼaka Onyenwe anyị; tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a:
6Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ, meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie.
7Dere duu nʼihu Onyenwe anyị, were ndidi chere ya; echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu, mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile.
8Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe; echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ.
9Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi, ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha.