7Azụ na-egbu m mgbu nke ukwuu ahụ adịghịkwa m.
8Ume ọbụla adịghịkwa nʼime. Adị m ka onye e gwepịara egwepịa. Ana m asụ ude nʼihi oke ihe mgbu nke obi.
9O Onyenwe m, ị maara agụụ niile nke na-agụ obi m; ịsụ ude m ezokwaghị ezo nʼebe ị nọ.
10Obi na-alọ m mmiri, ike na-agwụkwa m, ìhè esitekwala nʼanya m pụọ.
11Ndị m hụrụ nʼanya na ndị enyi m na-asọ m oyi nʼihi ọnya m, ndị agbataobi m na-anọ m ebe dị anya.