Abụ Ọma 42

Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele, otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke.

Psalm 42:1 (UKJV) As the hart pants after the water brooks, so pants my soul after you, O God.

1Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele, otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke.

2Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ. Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke?

3Anya mmiri m aghọọlara m ihe oriri nʼehihie ma nʼabalị, mgbe ndị mmadụ na-asị m ogologo ụbọchị niile, “Olee ebe Chineke gị nọ?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.