16mgbe ndị nkwulu na ndị nkọcha na-eji m eme ihe ọchị, nʼihi onye iro, onye kpebiri ịbọ ọbọ.
17Ọ bụ ezie na ihe ndị a adakwasịla anyị, ma anyị echefubeghị gị. Anyị enupubeghị isi nʼọgbụgba ndụ anyị na gị.
18Obi anyị ahapụbeghị gị! Anyị ahapụbekwaghị iso ụzọ gị.
19Ma i gwepịara anyị mee ka anyị bụrụ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị, jirikwa oke ọchịchịrị kpuchie anyị.
20Ọ bụrụ na anyị chefuru aha Chineke anyị, maọbụ na anyị gbasaara chi mba ọzọ aka anyị,