18Obi anyị ahapụbeghị gị! Anyị ahapụbekwaghị iso ụzọ gị.
19Ma i gwepịara anyị mee ka anyị bụrụ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị, jirikwa oke ọchịchịrị kpuchie anyị.
20Ọ bụrụ na anyị chefuru aha Chineke anyị, maọbụ na anyị gbasaara chi mba ọzọ aka anyị,
21ọ bụ na Chineke agaraghị achọpụta ya, ebe ọ maara ihe nzuzo niile dị nʼobi?
22Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji agba mgba, ogologo ụbọchị niile. A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu.