1O Chineke, anyị anụla; nna anyị ha agwakwala anyị ihe ndị i mere nʼoge ha, nʼoge gara aga.
2I ji aka gị chụpụ ndị mba ọzọ, ma kụnye nna nna anyị ha dịka osisi. I gwepịara ndị ahụ ma mee ka ndị nna anyị na-eto na-awasa.
3Ọ bụghị site na mma agha ha ka ha ji merie nweta ala a, ha emerighị site nʼike nke aka ha; ọ bụ aka nri gị, aka gị, na ìhè nke ihu gị nyere ha mmeri, nʼihi na ị hụrụ ha nʼanya.
4Ị bụ eze m na Chineke m, onye na-ekpebi na Jekọb aghaghị inwe mmeri.