Abụ Ọma 50

Onyenwe anyị, Chineke, Onye kachasị chi niile, ekwuola okwu ma kpọkọta ụwa niile, site na ọwụwa anyanwụ ruo na ọdịda ya.

Psalm 50:1 (UKJV) The mighty God, even the LORD, has spoken, and called the earth from the rising of the sun unto the going down thereof.

1Onyenwe anyị, Chineke, Onye kachasị chi niile, ekwuola okwu ma kpọkọta ụwa niile, site na ọwụwa anyanwụ ruo na ọdịda ya.

2Chineke na-enwupụta dịka ìhè, site na Zayọn, nke zuruoke nʼime ịma mma.

3Chineke anyị na-abịa, ọ gaghị emechikwa ọnụ; ọkụ na-erepịa erepịa dị nʼihu ya, oke ifufe na-efesi ike gbakwara ya gburugburu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.