2Chineke na-enwupụta dịka ìhè, site na Zayọn, nke zuruoke nʼime ịma mma.
3Chineke anyị na-abịa, ọ gaghị emechikwa ọnụ; ọkụ na-erepịa erepịa dị nʼihu ya, oke ifufe na-efesi ike gbakwara ya gburugburu.
4Ọ na-akpọku eluigwe na ụwa ka o kpee ndị ya ikpe: Ọ na-asị,
5“Chikọtaranụ m ndị m e doro nsọ, bụ ndị mụ na ha ji ịchụ aja gbaa ndụ.”
6Eluigwe na-ekwupụta ezi omume ya, nʼihi na Chineke nʼonwe ya bụ onye ikpe. Sela