Abụ Ọma 50

“Chikọtaranụ m ndị m e doro nsọ, bụ ndị mụ na ha ji ịchụ aja gbaa ndụ.”

Psalm 50:5 (UKJV) Gather my saints together unto me; those that have made a covenant with me by sacrifice.

3Chineke anyị na-abịa, ọ gaghị emechikwa ọnụ; ọkụ na-erepịa erepịa dị nʼihu ya, oke ifufe na-efesi ike gbakwara ya gburugburu.

4Ọ na-akpọku eluigwe na ụwa ka o kpee ndị ya ikpe: Ọ na-asị,

5“Chikọtaranụ m ndị m e doro nsọ, bụ ndị mụ na ha ji ịchụ aja gbaa ndụ.”

6Eluigwe na-ekwupụta ezi omume ya, nʼihi na Chineke nʼonwe ya bụ onye ikpe. Sela

7“Nụrụnụ, ndị m, m ga-ekwukwa, Izrel, aga m agba ama megide unu, Abụ m Chineke, Chineke unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.