Abụ Ọma 52

Nʼezie, Chineke ga-akwatu gị ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-ejide gị, dọpụta gị site nʼụlọ ikwu gị, ọ ga-ehopukwa gị site nʼala ndị dị ndụ. Sela

Psalm 52:5 (UKJV) God shall likewise destroy you for ever, he shall take you away, and pluck you out of your dwelling place, and root you out of the land of the living. Selah.

3Ị hụrụ ihe ọjọọ nʼanya karịa ihe ọma, ị hụrụ okwu ụgha nʼanya karịa eziokwu. Sela

4O onye ire aghụghọ! Ị hụrụ okwu ọbụla nke na-emegide mmadụ nʼanya.

5Nʼezie, Chineke ga-akwatu gị ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-ejide gị, dọpụta gị site nʼụlọ ikwu gị, ọ ga-ehopukwa gị site nʼala ndị dị ndụ. Sela

6Ndị ezi omume ga-ahụ ya tụkwaa egwu; ha ga-achị ya ọchị na-asị,

7“Ugbu a, lee nwoke ahụ, onye jụrụ ime Chineke ebe mgbaba ya. Ọ tụkwasịrị obi ya na akụnụba ya nke dị ukwuu. O sitekwara na ibibi ndị ọzọ ghọọ onye dị ike!”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.