10Ehihie na abalị, ha na-ejegharị nʼelu mgbidi ya; iro na mmegbu dị nʼime ya.
11A na-ahụta akaọrụ ihe ịla nʼiyi nʼime obodo; ihe ike na ụgha ewerela ọnọdụ ha nʼime obodo.
12A sị na ọ bụ onye iro ji m eme ihe ọchị, apụrụ m ịnagide ya; a sịkwa na ọ bụ onye iro na-eweli onwe ya megide m, apụrụ m izonarị onwe m site nʼebe ọ nọ.
13Maọbụ gị, nwoke dịka m, onye mụ na ya dị na mma, enyi m ọma,
14onye mụ na ya na-enwe mmekọrịta dị ụtọ na mbụ, nʼụlọ Chineke, ka anyị na-ejegharị nʼetiti ọha mmadụ bịara ife ofufe.