21Okwu ọnụ ya dị mụrụmụrụ ka bọta, ma ibu agha juru ya obi; okwu ya niile dị nro karịa mmanụ, ma ha bụ mma agha e welitere maka ibu agha.
22Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile, ọ ga-agba gị ume; ọ gaghị ekwe ka ewezuga onye ezi omume.
23Ma gị, O Chineke, ga-adọtu ndị ajọ omume nʼime olulu nke jupụtara nʼire ure; ndị ogbu mmadụ na ndị aghụghọ agaghị ebi ọ bụladị ọkara ndụ ha. Ma mụ onwe m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.