3nʼihi ihe onye iro m na-ekwu, nʼihi ịba mba nke ndị ajọ mmadụ, nʼihi na ha na-ewetara m ntaramahụhụ, na-akpagbu m nʼiwe ha.
4Obi m nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nʼime m; oke ụjọ nke ọnwụ abịakwasịla m.
5Ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji abịakwasịkwala m; oke egwu ekpuchiela m.
6Agwara m onwe m okwu sị, “A sịkwarị na m nwere nku dịka nduru! Agaara m efelaga ebe ọzọ gaa zuru ike.
7Agaara m efelaga ebe dị anya, ga nọrọ nʼọzara; Sela