5Ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji abịakwasịkwala m; oke egwu ekpuchiela m.
6Agwara m onwe m okwu sị, “A sịkwarị na m nwere nku dịka nduru! Agaara m efelaga ebe ọzọ gaa zuru ike.
7Agaara m efelaga ebe dị anya, ga nọrọ nʼọzara; Sela
8Agaara m eme ngwangwa gaa nʼebe mgbaba m, ebe dị anya site nʼebe ifufe siri ike na oke ifufe dị.”
9O Onyenwe anyị, gbagwojuo ndị ajọ omume anya, mee ka ha ghara ịghọta ihe ibe ha na-ekwu, nʼihi na ana m ahụ ihe ike na ịlụ ọgụ nʼime obodo.