8elu ụwa mara jijiji, eluigwe wụpụrụ mmiri ozuzo, nʼihu Chineke, Onye Saịnaị, nʼihu Chineke, Chineke nke Izrel.
9I nyere mmiri ozuzo nʼebe ọ dị ukwuu, O Chineke, i tutere ihe nketa gị nke ike gwụrụ.
10Ndị gị biri nʼime ya, site nʼoke akụnụba gị, O Chineke, ị rọpụtaara ndị ogbenye mkpa ha.
11Onyenwe anyị kpọsara okwu ahụ, ọnụọgụgụ ndị inyom kwusara ya bụ igwe dị ọtụtụ;
12ndị eze na ndị agha ha ji ọsọ gbalaa; ndị mmadụ kere ihe a dọtara nʼagha, nʼime ọmụma ụlọ ikwu.