19Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke anyị, na Onye Nzọpụta anyị, Onye na-ebu ibu arọ anyị ụbọchị niile. Sela
20Chineke anyị bụ Chineke na-azọpụta; mgbapụta pụọ nʼọnwụ na-esite nʼaka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
21Nʼezie, Chineke ga-egwepịa isi ndị iro ya niile, isi ndị niile na-aga nʼihu ibi ndụ mmehie.
22Onyenwe anyị kwuru sị, “Aga m esite na Bashan kpọlata ha, aga m adọpụta ha site nʼebe omimi nke osimiri,
23ka unu nwee ike saa ụkwụ unu nʼime ọbara ndị iro unu, ka ire nkịta unu niile ketakwa oke nke ha.”