26Too Chineke nʼetiti nzukọ ukwuu ahụ; toonu Onyenwe anyị nʼetiti nzukọ ụmụ Izrel.
27Lee Benjamin bụ agbụrụ dịkarịsịrị nta, ka ọ na-edu ha, lekwaa igwe ụmụ ndị eze Juda na nke Zebụlọn na Naftalị.
28O Chineke, kpọlite ike gị; mee ka ike gị pụta ìhè, O Chineke, dịka i mere na mbụ.
29Nʼihi ụlọnsọ ukwu gị nke dị na Jerusalem, ndị eze ga-ewetara gị onyinye dị iche iche.
30Baara anụ ọhịa ahụ zoro nʼetiti riidi mba, igwe oke ehi nọ nʼetiti ụmụ ehi nke mba niile. Site na nweda nʼala, ka o wetara gị ogbe ọlaọcha. Chụsasịa mba niile, bụ ndị na-enwe mmasị nʼibu agha.