Abụ Ọma 68

Too Chineke nʼetiti nzukọ ukwuu ahụ; toonu Onyenwe anyị nʼetiti nzukọ ụmụ Izrel.

Psalm 68:26 (UKJV) Bless all of you God in the congregations, even the Lord, from the fountain of Israel.

24O Chineke, ahụla igwe ahịrị mmadụ ndị na-eso gị, bụ igwe ahịrị mmadụ nke so Chineke m, na Eze m na-aba nʼebe nsọ ahụ.

25Ndị na-abụ abụ nọ nʼihu, ndị na-eti egwu, na-eso ha nʼazụ; ụmụ agbọghọ na-akpọ ụbọ sokwa ha.

26Too Chineke nʼetiti nzukọ ukwuu ahụ; toonu Onyenwe anyị nʼetiti nzukọ ụmụ Izrel.

27Lee Benjamin bụ agbụrụ dịkarịsịrị nta, ka ọ na-edu ha, lekwaa igwe ụmụ ndị eze Juda na nke Zebụlọn na Naftalị.

28O Chineke, kpọlite ike gị; mee ka ike gị pụta ìhè, O Chineke, dịka i mere na mbụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.