14Dọpụta m site nʼụrụrọ, ekwela ka m mikpuo; zọpụta m site nʼaka ndị kpọrọ m asị, site na mmiri miri emi.
15Ekwela ka uju mmiri kpuchie m, maọbụ ka ebe dị omimi loda m, ma ọ bụkwanụ ka olulu lomie m, kpuchie m nʼime ọnụ ya.
16O Onyenwe anyị, zaa m, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, nʼime ịdị ukwuu nke oke ebere gị, chee m ihu.
17Ezonarịla mụ bụ ohu gị ihu gị. Anọ m na nsogbu, mee ngwangwa zaa m!
18Bịa m nso zọpụta m. Gbapụta m site nʼaka ndị iro m.