16O Onyenwe anyị, zaa m, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, nʼime ịdị ukwuu nke oke ebere gị, chee m ihu.
17Ezonarịla mụ bụ ohu gị ihu gị. Anọ m na nsogbu, mee ngwangwa zaa m!
18Bịa m nso zọpụta m. Gbapụta m site nʼaka ndị iro m.
19Ị maara ihe niile banyere ihe ọchị ha ji m mee, mweda nʼala m na ihe ihere: ndị iro m niile nọkwa gị nʼihu.
20Ọchị ha na-achị m etiwaala m obi, ma hapụ m nʼọnọdụ enweghị inyeaka. Elere m anya onye ga-emere m ebere, ma ọ dịghị onye ọbụla m hụrụ; lee anya ndị ga-akasị m obi, ma ọ dịkwaghị onye m chọtara.