21Ha tinyere oluilu nʼime nri m, nyekwa m mmanya gbara ụka ka m ṅụọ.
22Ka tebul e debere nʼihu ha ghọrọ ha ọnya; ka ọ bụrụ ha ihe ịbọ ọbọ mgbe ha nọ nʼudo ya ghọrọ ha ọnya igbudu.
23Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ ọzọ, mekwa ka ụkwụ ha na-ama jijiji mgbe niile.
24Wụkwasị ha oke iwe gị, ka iwe gị dị ọkụ zute ha.
25Ka ebe obibi ha tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ụlọ ikwu ha.