Abụ Ọma 69

Onyenwe anyị na-anụ ekpere ndị nọ na mkpa, ọ naghị eledakwa ndị ya a dọtara nʼagha anya.

Psalm 69:33 (UKJV) For the LORD hears the poor, and despises not his prisoners.

31Nke a ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ karịa oke ehi, karịa oke ehi, nke mpi ya na ụkwụ ya ka dị.

32Ndị ogbenye ga-ahụ ya ma ṅụrịakwa ọṅụ; unu ndị na-achọ Chineke, ka obi unu na-adị ndụ.

33Onyenwe anyị na-anụ ekpere ndị nọ na mkpa, ọ naghị eledakwa ndị ya a dọtara nʼagha anya.

34Ka eluigwe na ụwa too ya, osimiri niile na ihe niile bi nʼime ha.

35Nʼihi na Chineke ga-azọpụta Zayọn; ọ ga-ewugharị obodo niile nke Juda. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ebi nʼime ya, mee ya ihe nweta ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.