30Aga m eji ịbụ abụ too aha Chineke, jirikwa ekele bulie ya elu.
31Nke a ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ karịa oke ehi, karịa oke ehi, nke mpi ya na ụkwụ ya ka dị.
32Ndị ogbenye ga-ahụ ya ma ṅụrịakwa ọṅụ; unu ndị na-achọ Chineke, ka obi unu na-adị ndụ.
33Onyenwe anyị na-anụ ekpere ndị nọ na mkpa, ọ naghị eledakwa ndị ya a dọtara nʼagha anya.
34Ka eluigwe na ụwa too ya, osimiri niile na ihe niile bi nʼime ha.