28Mee ka e hichapụ aha ha site nʼakwụkwọ nke ndụ, ka a hapụ idekọta aha ha na nke ndị ezi omume.
29Anọ m nʼụfụ na ihe mgbu, O Chineke, mee ka nzọpụta gị kpuchie m.
30Aga m eji ịbụ abụ too aha Chineke, jirikwa ekele bulie ya elu.
31Nke a ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ karịa oke ehi, karịa oke ehi, nke mpi ya na ụkwụ ya ka dị.
32Ndị ogbenye ga-ahụ ya ma ṅụrịakwa ọṅụ; unu ndị na-achọ Chineke, ka obi unu na-adị ndụ.