1Onyenwe anyị Chineke m, nʼime gị ka m gbabara; zọpụta m, ma napụta m site nʼaka ndị niile na-achụ m ọsọ,
2ma ọ bụ ha adọkaa m dịka ọdụm, ha ga-adọsasịkwa m ebe mmadụ ọbụla enweghị ike ịnapụta m.
3O Onyenwe anyị Chineke m, ọ bụrụ na m mere ihe dị otu a; ọ bụrụkwa na aka m adịghị ọcha.