16Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a; ka ha na-efufegharị nʼelu ugwu niile. Ka mkpụrụ ubi ya wasaa dịka Lebanọn; ka mmadụ jupụta nke ọma nʼobodo dịka ahịhịa ndụ nke ọhịa.
17Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide. A ga-esite na ya gọzie mba niile, a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi.
18Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke, Chineke nke Izrel, onye naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche.
19Otuto dịrị aha ya dị ebube ruo ebighị ebi; ka ụwa niile jupụta nʼebube ya. Amen na Amen.
20Nke a bụ ọgwụgwụ ekpere Devid nwa Jesi.