8Ha na-akwa emo, na-ejikwa iro ekwu okwu; nʼime mpako ha, ha na-aba mba imegbu ndị ọzọ.
9Ha ji ọnụ ha na-ekwu na eluigwe bụ nke ha, ha jikwa ire ha kwuo na ụwa niile bụ nke ha.
10Nʼihi nke a, ndị ha na-eso ha, na-aṅụrụ okwu ha ebe ọ bara ụba dịka mmiri.
11Ha na-asị, “Olee otu Chineke ga-esi mara? Ọ dịkwanụ ihe Onye kachasị ihe niile elu maara?”
12Otu a ka ndị ajọ omume dị, ha na-ebi ndụ na-enweghị nsogbu; akụnụba ha na-amụbakwa.