6Nʼihi nke a, nganga bụ ihe ịnya nʼolu ha; ha jikwa ihe ike kpuchie onwe ha dịka uwe.
7Mmehie na-esite nʼobi ọjọọ ha apụta; echiche ọjọọ ha enweghị ngụta.
8Ha na-akwa emo, na-ejikwa iro ekwu okwu; nʼime mpako ha, ha na-aba mba imegbu ndị ọzọ.
9Ha ji ọnụ ha na-ekwu na eluigwe bụ nke ha, ha jikwa ire ha kwuo na ụwa niile bụ nke ha.
10Nʼihi nke a, ndị ha na-eso ha, na-aṅụrụ okwu ha ebe ọ bara ụba dịka mmiri.