17tutu ruo mgbe m bara nʼebe nsọ Chineke; mgbe ahụ ka m ghọtara ihe ga-eme ha nʼikpeazụ.
18Nʼezie, ị na-eguzo ha nʼala na-achị achị; ị na-atụda ha, laa ha nʼiyi.
19Lee, ka ha si laa nʼiyi nʼotu ntabi anya, bụrụ ndị ihe egwu dị iche iche kpochapụrụ kpamkpam!
20Dịka nrọ, mgbe mmadụ na-eteta, otu a, O Onyenwe anyị, mgbe i tetara, ị ga-eleda ha anya dịka echiche na-agaghị emezu.
21Mgbe m nọ nʼobi mwute; mmụọ m dara mba.