19Lee, ka ha si laa nʼiyi nʼotu ntabi anya, bụrụ ndị ihe egwu dị iche iche kpochapụrụ kpamkpam!
20Dịka nrọ, mgbe mmadụ na-eteta, otu a, O Onyenwe anyị, mgbe i tetara, ị ga-eleda ha anya dịka echiche na-agaghị emezu.
21Mgbe m nọ nʼobi mwute; mmụọ m dara mba.
22Abụ m onye nzuzu na onye na-amaghị ihe. Adị m ka anụ ọhịa nʼihu gị.
23Ma ana m anọnyere gị mgbe niile; ị na-ejide m nʼaka nri m.