20Dịka nrọ, mgbe mmadụ na-eteta, otu a, O Onyenwe anyị, mgbe i tetara, ị ga-eleda ha anya dịka echiche na-agaghị emezu.
21Mgbe m nọ nʼobi mwute; mmụọ m dara mba.
22Abụ m onye nzuzu na onye na-amaghị ihe. Adị m ka anụ ọhịa nʼihu gị.
23Ma ana m anọnyere gị mgbe niile; ị na-ejide m nʼaka nri m.
24Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m, ma emesịa, ị ga-anabata m nʼebube gị.