22Abụ m onye nzuzu na onye na-amaghị ihe. Adị m ka anụ ọhịa nʼihu gị.
23Ma ana m anọnyere gị mgbe niile; ị na-ejide m nʼaka nri m.
24Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m, ma emesịa, ị ga-anabata m nʼebube gị.
25Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị? Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị.
26Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba, ma Chineke bụ ike nke obi m, na ihe nketa m ruo ebighị ebi.