2Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwantịị ka m zọhie ụkwụ, ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ m gbụchapụ.
3Nʼihi na e kwosara m ndị mpako ekworo; mgbe m hụrụ ịba ụba nke ndị ajọ omume.
4Ha anaghị adọgbu onwe ha; ahụ ha gbara abụba, siekwa ike.
5Nsogbu niile mmadụ ibe ha na-enwe adịghị erute ha. Ha enweghị mkpa ọbụla nke na-akpa ha dịka ndị ọzọ nwere.
6Nʼihi nke a, nganga bụ ihe ịnya nʼolu ha; ha jikwa ihe ike kpuchie onwe ha dịka uwe.